Connect with us

News

Biafra Remembrance 2020: Ndị Igbo niile ga ebido ụtụ otu narị naira n’ọdịnịhu – Nwodo

Published

on

Tony Nnadi Onyeka Onwenu Nnia NwodoImage copyrightBBC/GETTY IMAGES/TONY NNADI

Taa bụ ụbọchị iri atọ nke ọnwa Mee bụ ụbọchị Igbi niile ji echeta ndị nwụrụ n’agha Biafra malitere n’afọ 1967.

N’ihi nke a BBC Igbo hibere mkparịtaụka ebe ndị bụ isi ahụrụ kwaba okpu n’ala Igbo bịara sonye.

Ha gụnyere Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo, Onyeka Onwenu bụ otiegwu a ma ama nakwa Tony Nnadi bụ

Lee okwu ndị dị mkpa ha tinyere ọnụ na ya.

Ihe ha hụrụ n’agha Biafra:

Ụmụaka agha Biafra

Nnia Nwodo bụ onye mbụ kọwara ihe anya ya hụrụ.

O kwuru na mgbe ahụ, onye ọbụla ruru “5ft 6″” na-esonye n’agha ahụ nke ụmụaka akpọrọ “Organization of Biafran Freedom Fighters”

“Anyị na-aga alụ ọgụ n’ebe ndịagha Naịjirịa nọ” ka o kwuru.

Media captionO meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme

Onyekwa Onwenu kwuru na o nyere aka n’agha Biafra site n’ịnye aka n’ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ndị merụrụ ahụ n’agha.

N’ọnụ ya “a mụrụ m ọrụ izuụka abụọ tupu m mmalite ọrụ, anyị na-akụziri ndị mmadụ gbasara nri ha ga-eri”

O kwuru na ọ dị mkpa ka ụmụ Igbo niile mara ihe mere n’agha ahụ n’ihi na agụrụ gburu ọtụtụ mmadụ na ahụhụ ndị ọzọ ndị Igbo tara.

Tony Nnadi n’onwe ya kwuru na amụrụ ya n’afọ 1966 nke mere na ọ ka dị afọ atọ mgbe agha biri.

Mana n’uche ya agha ahụ ebibeghi ya mere na o sonyere ndị na-agagharị na-achọ ihe a ga-eme ka agha ahụ bie n’ezie.

Ndụmọdụ ha nyere ndị Igbo

Ndị na agba ekwu

Tony Nnadi kwuru na njem ndị Igbo na ndị Naịjirịa kwesiri ka achịkọta ya ọnụ ka o were bie ebi.

O kwuru na akụkwọ Iwu Naịjirịa kere ndị Igbo agbụ n’aka n’ihi na o nweghi onye ga-eji ya zọọ ọkwa ọbụla ọ chọrọ ị zọ ma zọta ihe.

Ọ gwara ndị na-achọ mwereonwe Biafra na nkata akpara iji “bupu ozu Naịjirịa” amịtala mkpụrụ.

Onyeka Onwenu gwara Igbo niile na site ugbua gaa ihu, ha welie isi ha elu ka onwe ha ju ha afọ.

“Unu asizina ndo maka na unu bụ ndị Igbo, bụrụ nụ ndị kachasị n’ihe niile unu na-eme” ka o kwuru.

Ihe ọzọ o kwuru na Igbo kwesiri na ịgba mbọ n’ọgbakọ nakwa na nke onwe ha n’ihi na anyị bụ ndị Igbo.

Nnia Nwodo kwuru na ọnọdụ ndị Igbo nọ na ya bụ ihe na-ewute onye ọbụla,

Ọ sị “ọbụru na anyị apụtaghị n’ọnọdụ a, o nwereike ịbuba anyị n’agha ọzọ, Chineke mee ka ọ ghara ịduba anyị n’agha”

O kelere ndị ntorọbịa na-eche nche n’ebe dị ịcheiche n’ala Igbo ma gwa ha jisike na ha bụ ndị nna kwụ ha n’azụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Continue Reading
Click to comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

Copyright © 2019. powered by Iexclusivenews